Ewumewu Ndamọgwụ Dịka Usoro Nchekwa Ahụike Ọdịnala Igbo: Nlekwasịanya N’Orogwe
Keywords:
Ewumewu, Ndamọgwụ, Ọgwụ, Ahụike, ỌdịnalaAbstract
Ịgwọọrịa n’usoro ọdịnala bụ ihe zuru mba ụwa niile ọnụọkachasị ndị isi oji mba Afrika. Nke gụnyere ala anyị bụ Naijiria. N’ihi ọgwụgwọọrịa n’usoro ọdịnala, ụfọdụ mmadụ agaala dara ọgwụ iji hụ na echekwara ahụike
mmadụ n’usoro ọdịnala. Ndamọgwụ a bụghị nke onye ọ bụla na-etinye isi n’ihi ọbụghị ihe zuru Igbo ọnụ, ọ bụghịkwanụ njem onye ọbụla na-etinye isi n’ime, kama ọ bụ ekere sitere na chi. Nke a mere na ihe nchọcha a lebara anya ịhụ ka o si metụta obodo a bụ Orogwe nke dị n’Owere West nke Steeti Imo n’ụzọ ha si adara ọgwụ. Na nchọcha a, a ga-elebanya na nkọwa ihe bụ “Ndamọgwụ” dịka ewumewu ọdịnala nke metụtara nchekwa ahụike nke mmadụ. N’ime ka ebumnuche ederede a pụta ihe nke ọma, onye nchọcha gara n’ihu Igba otu onye dibịa ọdịnala ajụjụọnụ nke ruturu aka n’ihe ndịọ gabigara na ndụ tupu ọ hụta onwe ya dịka onye na-echekwa ahụike mmadụ n’usoro ọdịnala. Onye nchọcha lebakwara anya na ewumewu metụtara dibịa n’ụzọ dịgasị iche iche n’ala Igbo nkọwa ihe bụ ahụike, ihe ndị daraọgwụ naagabiga tupu ọrụ ha apụta ihe. Ọzọkwa, onye nchọcha rụtụkwaraaka uru iji usoro ọdịnala chekwa ahụike na atụmatụ ndị dara ọgwụ naatụpụta na ndụ ndị mmadụ. Onye nchọcha webatara ụdị ihe ndị eji agwọọrịa dịka osi metụta mgbọrọgwụ, mkpakwụkwọ, ọbụladị oke osisi, azụ osisi, oru mba dgz. N’ikpeazụ, o lebara anya na ihe ndị ga-eme ka Ndamọgwụ hara ịbụ egwu achịụtaba n’aka akpọ maka na ọ bụghị ihe onye isi akaghị aka naetinye isi ma ọ
bụrụ na ọbụghịọkpụkpọ oku nke ekerechi.